Ndị Rom 10:18
Romans 10:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”*
Romans 10:18 in English
Romans 10:18 · Berean Standard Bible
But I ask, did they not hear? Indeed they did: “Their voice has gone out into all the earth, their words to the ends of the world.”*
Context
16Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”* 17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. 18Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie.
“Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo,
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”* 19Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị,
“Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu;
aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”* 20Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị,
“Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m,
ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.