Ndị Rom 10:19
Romans 10:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị, “Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu; aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”*
Romans 10:19 in English
Romans 10:19 · Berean Standard Bible
I ask instead, did Israel not understand? First, Moses says: “I will make you jealous by those who are not a nation; I will make you angry by a nation without understanding.”*
Context
17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. 18Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie.
“Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo,
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”* 19Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị,
“Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu;
aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”* 20Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị,
“Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m,
ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.”* 21O kwuru banyere ndị Izrel,
“Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile
nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”*
10:5 Lev 18:5
10:6 Dit 30:12
10:7 Dit 30:13
10:8 Dit 30:14
10:11 Aịz 28:16
10:13 Jul 2:32
10:15 Aịz 52:7
10:16 Aịz 53:1
10:18 Abụ 19:4
10:19 Dit 32:21
10:20 Aịz 65:1
10:21 Aịz 65:2
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.