Ndị Rom 10:17
Romans 10:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.
Romans 10:17 in English
Romans 10:17 · Berean Standard Bible
Consequently, faith comes by hearing, and hearing by the word of Christ.
Context
15Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”* 16Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”* 17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. 18Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie.
“Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo,
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”* 19Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị,
“Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu;
aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.