Native Bible

Psalms 97 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 97
1Onyenwe anyị bụ eze,* ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa. 2Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya. 3Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla. 4Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile; ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji. 5Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu Onyenwe ụwa niile. 6Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya. 7A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe, ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee feenụ ya ofufe, unu chi niile! 8Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ, obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị. 9Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile; ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile. 10Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị, nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume. 11Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume, ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi. 12Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume, tookwanụ aha nsọ ya. 97:1 Abụ 96:10; Abụ 99:1

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.