Abụ Ọma 97:2
Psalms 97:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.
Psalms 97:2 in English
Psalms 97:2 · Berean Standard Bible
Clouds and darkness surround Him; righteousness and justice are His throne’s foundation.
Context
1Onyenwe anyị bụ eze,* ka ụwa niile nwee obi ụtọ;
ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa. 2Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu;
ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya. 3Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya
ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla. 4Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile;
ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.