Abụ Ọma 97:8
Psalms 97:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ, obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.
Psalms 97:8 in English
Psalms 97:8 · Berean Standard Bible
Zion hears and rejoices, and the towns of Judah exult because of Your judgments, O LORD.
Context
6Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya;
ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya. 7A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe,
ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee
feenụ ya ofufe, unu chi niile! 8Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ,
obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ
nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị. 9Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile;
ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile. 10Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị,
nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi
ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.