Native Bible

Psalms 89:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile!

Psalms 89:47 in English

Psalms 89:47 · Berean Standard Bible

Remember the briefness of my lifespan! For what futility You have created all men!

Context

45I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ. I ji ihere dịka akwa kpuchie ya. 46Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ? 47Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile! 48Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili*? Sela 49O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.