Abụ Ọma 89:49
Psalms 89:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?
Psalms 89:49 in English
Psalms 89:49 · Berean Standard Bible
Where, O Lord, is Your loving devotion of old, which You faithfully swore to David?
Context
47Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa.
Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile! 48Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya,
maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili*? Sela 49O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị,
nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi? 50Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya,
otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile. 51O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo,
nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.