Abụ Ọma 89:50
Psalms 89:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.
Psalms 89:50 in English
Psalms 89:50 · Berean Standard Bible
Remember, O Lord, the reproach of Your servants, which I bear in my heart from so many people—
Context
48Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya,
maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili*? Sela 49O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị,
nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi? 50Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya,
otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile. 51O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo,
nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ. 52Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Amen na Amen.
89:25 Ọ ga-achị oke osimiri na osimiri niile
89:25 Oke osimiri na osimiri niile a na-ekwu banyere ha nʼebe a, bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis, na osimiri ndị ọzọ niile na-asọbanye nʼime ha. Oke ala ochie ahụ e kwere Devid na Solomọn na nkwa jedebere nʼosimiri ndị a.
89:48 Ya bụ, ala mmụọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.