Native Bible

Psalms 74:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.

Psalms 74:9 in English

Psalms 74:9 · Berean Standard Bible

There are no signs for us to see. There is no longer any prophet. And none of us knows how long this will last.

Context

7Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị. 8Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ. 9Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ. 10O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi? 11Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.