Native Bible

Psalms 74:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!

Psalms 74:11 in English

Psalms 74:11 · Berean Standard Bible

Why do You withdraw Your strong right hand? Stretch it out to destroy them!*

Context

9Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ. 10O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi? 11Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi! 12Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa. 13Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.