Abụ Ọma 74:11
Psalms 74:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
Psalms 74:11 in English
Psalms 74:11 · Berean Standard Bible
Why do You withdraw Your strong right hand? Stretch it out to destroy them!*
Context
9Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke.
Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ.
Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ. 10O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị?
Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi? 11Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị?
Sepụta aka gị laa ha nʼiyi! 12Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie.
Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa. 13Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ.
Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.