Native Bible

Psalms 74:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?

Psalms 74:10 in English

Psalms 74:10 · Berean Standard Bible

How long, O God, will the enemy taunt You? Will the foe revile Your name forever?

Context

8Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ. 9Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ. 10O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi? 11Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi! 12Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.