Abụ Ọma 74:7
Psalms 74:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
Psalms 74:7 in English
Psalms 74:7 · Berean Standard Bible
They have burned Your sanctuary to the ground; they have defiled the dwelling place of Your Name.
Context
5Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike
ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa. 6Ha ji anyụike na egbugbu ha
kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe. 7Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa.
Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị. 8Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!”
Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ. 9Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke.
Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ.
Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.