Native Bible

Psalms 69:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.

Psalms 69:20 in English

Psalms 69:20 · Berean Standard Bible

Insults have broken my heart, and I am in despair. I looked for sympathy, but there was none, for comforters, but I found no one.

Context

18Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m. 19Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere: ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu. 20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara. 21Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ. 22Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya; ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.