Abụ Ọma 69:22
Psalms 69:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya; ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.
Psalms 69:22 in English
Psalms 69:22 · Berean Standard Bible
May their table become a snare; may it be a retribution and a trap.*
Context
20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi,
ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka.
Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ;
lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara. 21Ha tinyere oluilu nʼime nri m,
nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ. 22Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya;
ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu. 23Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ,
mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile. 24Wụkwasị ha oke iwe gị,
ka iwe gị dị ọkụ zute ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.