Native Bible

Psalms 69:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.

Psalms 69:21 in English

Psalms 69:21 · Berean Standard Bible

They poisoned my food with gall and gave me vinegar to quench my thirst.

Context

19Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere: ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu. 20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara. 21Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ. 22Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya; ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu. 23Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ, mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.