Native Bible

Psalms 69:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.

Psalms 69:18 in English

Psalms 69:18 · Berean Standard Bible

Draw near to my soul and redeem me; ransom me because of my foes.

Context

16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu. 17Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị. Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m! 18Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m. 19Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere: ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu. 20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.