Abụ Ọma 69:18
Psalms 69:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.
Psalms 69:18 in English
Psalms 69:18 · Berean Standard Bible
Draw near to my soul and redeem me; ransom me because of my foes.
Context
16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị,
nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu. 17Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị.
Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m! 18Bịa m nso zọpụta m.
Gbapụta m site nʼaka ndị iro m. 19Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere:
ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu. 20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi,
ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka.
Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ;
lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.