Abụ Ọma 69:16
Psalms 69:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
Psalms 69:16 in English
Psalms 69:16 · Berean Standard Bible
Answer me, O LORD, for Your loving devotion is good; turn to me in keeping with Your great compassion.
Context
14Dọpụta m site nʼụrụrọ,
ekwela ka m mikpuo;
zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị,
site na mmiri miri emi. 15Ekwela ka uju mmiri kpuchie m,
maọbụ ka ebe dị omimi loda m,
ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya. 16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị,
nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu. 17Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị.
Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m! 18Bịa m nso zọpụta m.
Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.