Native Bible

Psalms 69:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.

Psalms 69:15 in English

Psalms 69:15 · Berean Standard Bible

Do not let the floods engulf me or the depths swallow me up; let not the Pit close its mouth over me.

Context

13O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị. 14Dọpụta m site nʼụrụrọ, ekwela ka m mikpuo; zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị, site na mmiri miri emi. 15Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya. 16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu. 17Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị. Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.