Abụ Ọma 69:13
Psalms 69:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.
Psalms 69:13 in English
Psalms 69:13 · Berean Standard Bible
But my prayer to You, O LORD, is for a time of favor. In Your abundant loving devotion, O God, answer me with Your sure salvation.
Context
11Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m,
a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị. 12Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ,
abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ. 13O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere,
nʼoge ihuọma gị;
na oke ịhụnanya gị, O Chineke m,
zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị. 14Dọpụta m site nʼụrụrọ,
ekwela ka m mikpuo;
zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị,
site na mmiri miri emi. 15Ekwela ka uju mmiri kpuchie m,
maọbụ ka ebe dị omimi loda m,
ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.