Abụ Ọma 69:11
Psalms 69:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m, a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.
Psalms 69:11 in English
Psalms 69:11 · Berean Standard Bible
I made sackcloth my clothing, and I was sport to them.
Context
9Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi,
ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m. 10Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ,
ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a. 11Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m,
a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị. 12Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ,
abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ. 13O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere,
nʼoge ihuọma gị;
na oke ịhụnanya gị, O Chineke m,
zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.