Abụ Ọma 69:10
Psalms 69:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ, ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.
Psalms 69:10 in English
Psalms 69:10 · Berean Standard Bible
I wept and fasted, but it brought me reproach.
Context
8Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ,
nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ. 9Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi,
ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m. 10Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ,
ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a. 11Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m,
a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị. 12Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ,
abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.