Native Bible

Psalms 69:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.

Psalms 69:8 in English

Psalms 69:8 · Berean Standard Bible

I have become a stranger to my brothers and a foreigner to my mother’s sons,

Context

6Ekwela ka ihere mee ndị na-atụkwasị gị obi nʼihi m, O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; ka ndị na-achọ gị ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m, O Chineke nke Izrel. 7Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo, ihere ekpuchiela m ihu. 8Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ. 9Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi, ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m. 10Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ, ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.