Abụ Ọma 69:6
Psalms 69:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ekwela ka ihere mee ndị na-atụkwasị gị obi nʼihi m, O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; ka ndị na-achọ gị ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m, O Chineke nke Izrel.
Psalms 69:6 in English
Psalms 69:6 · Berean Standard Bible
May those who hope in You not be ashamed through me, O Lord GOD of Hosts; may those who seek You not be dishonored through me, O God of Israel.
Context
4Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu
karịa agịrị isi dị m nʼisi.
Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu,
bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha.
Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi
ihe m na-ezughị nʼohi. 5Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile;
ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị. 6Ekwela ka ihere mee ndị
na-atụkwasị gị obi nʼihi m,
O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;
ka ndị na-achọ gị
ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m,
O Chineke nke Izrel. 7Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo,
ihere ekpuchiela m ihu. 8Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ,
nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.