Abụ Ọma 69:5
Psalms 69:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile; ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.
Psalms 69:5 in English
Psalms 69:5 · Berean Standard Bible
You know my folly, O God, and my guilt is not hidden from You.
Context
3Akpịrị akpọọla m nkụ;
ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka.
Anya m agbaala ọchịchịrị
ebe m na-ele anya Chineke.* 4Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu
karịa agịrị isi dị m nʼisi.
Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu,
bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha.
Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi
ihe m na-ezughị nʼohi. 5Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile;
ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị. 6Ekwela ka ihere mee ndị
na-atụkwasị gị obi nʼihi m,
O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;
ka ndị na-achọ gị
ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m,
O Chineke nke Izrel. 7Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo,
ihere ekpuchiela m ihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.