Abụ Ọma 69:4
Psalms 69:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu karịa agịrị isi dị m nʼisi. Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu, bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha. Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi ihe m na-ezughị nʼohi.
Psalms 69:4 in English
Psalms 69:4 · Berean Standard Bible
Those who hate me without cause outnumber the hairs of my head; many are those who would destroy me— my enemies for no reason.* Though I did not steal, I must repay.
Context
2Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi,
e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị.
Abịala m nʼebe mmiri dị omimi;
uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m. 3Akpịrị akpọọla m nkụ;
ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka.
Anya m agbaala ọchịchịrị
ebe m na-ele anya Chineke.* 4Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu
karịa agịrị isi dị m nʼisi.
Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu,
bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha.
Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi
ihe m na-ezughị nʼohi. 5Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile;
ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị. 6Ekwela ka ihere mee ndị
na-atụkwasị gị obi nʼihi m,
O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;
ka ndị na-achọ gị
ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m,
O Chineke nke Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.