Abụ Ọma 69:2
Psalms 69:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi, e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị. Abịala m nʼebe mmiri dị omimi; uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m.
Psalms 69:2 in English
Psalms 69:2 · Berean Standard Bible
I have sunk into the miry depths, where there is no footing; I have drifted into deep waters, where the flood engulfs me.
Context
1O Chineke, zọpụta m,
nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu. 2Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi,
e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị.
Abịala m nʼebe mmiri dị omimi;
uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m. 3Akpịrị akpọọla m nkụ;
ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka.
Anya m agbaala ọchịchịrị
ebe m na-ele anya Chineke.* 4Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu
karịa agịrị isi dị m nʼisi.
Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu,
bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha.
Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi
ihe m na-ezughị nʼohi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.