Abụ Ọma 69:14
Psalms 69:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dọpụta m site nʼụrụrọ, ekwela ka m mikpuo; zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị, site na mmiri miri emi.
Psalms 69:14 in English
Psalms 69:14 · Berean Standard Bible
Rescue me from the mire and do not let me sink; deliver me from my foes and out of the deep waters.
Context
12Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ,
abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ. 13O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere,
nʼoge ihuọma gị;
na oke ịhụnanya gị, O Chineke m,
zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị. 14Dọpụta m site nʼụrụrọ,
ekwela ka m mikpuo;
zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị,
site na mmiri miri emi. 15Ekwela ka uju mmiri kpuchie m,
maọbụ ka ebe dị omimi loda m,
ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya. 16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị,
nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.