Native Bible

Psalms 50:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu?

Psalms 50:16 in English

Psalms 50:16 · Berean Standard Bible

To the wicked, however, God says, “What right have you to recite My statutes and to bear My covenant on your lips?

Context

14“Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu, 15ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.” 16Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu? 17Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu. 18Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.