Native Bible

Psalms 50:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.

Psalms 50:18 in English

Psalms 50:18 · Berean Standard Bible

When you see a thief, you befriend him, and throw in your lot with adulterers.

Context

16Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu? 17Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu. 18Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke. 19Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi. 20Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.