Abụ Ọma 50:20
Psalms 50:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.
Psalms 50:20 in English
Psalms 50:20 · Berean Standard Bible
You sit and malign your brother; you slander your own mother’s son.
Context
18Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka;
unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke. 19Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ,
okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi. 20Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile,
na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke. 21Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị;
unu chekwara na adị m ka unu.
Ma aga m abara unu mba
ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu. 22“Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke,
ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.