Native Bible

Psalms 50:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.

Psalms 50:21 in English

Psalms 50:21 · Berean Standard Bible

You have done these things, and I kept silent; you thought I was * just like you. But now I rebuke you and accuse you to your face.*

Context

19Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi. 20Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke. 21Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu. 22“Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke, ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu. 23Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.