Abụ Ọma 40:6
Psalms 40:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aja na onyinye* abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.
Psalms 40:6 in English
Psalms 40:6 · Berean Standard Bible
Sacrifice and offering You did not desire, but my ears You have opened.* Burnt offerings and sin offerings You did not require.
Context
4Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,
onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;
onye na-adịghị ele ndị mpako anya
maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.* 5O Onyenwe anyị Chineke m,
ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ,
ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile
ị kwadooro maka inye anyị;
a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha,
ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu. 6Aja na onyinye* abụghị ihe ị chọrọ
ma ị megheela ntị abụọ;
aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m,
e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ,
iwu gị dị nʼime obi m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.