Abụ Ọma 40:7
Psalms 40:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.
Psalms 40:7 in English
Psalms 40:7 · Berean Standard Bible
Then I said, “Here I am, I have come— it is written about me in the scroll:
Context
5O Onyenwe anyị Chineke m,
ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ,
ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile
ị kwadooro maka inye anyị;
a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha,
ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu. 6Aja na onyinye* abụghị ihe ị chọrọ
ma ị megheela ntị abụọ;
aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m,
e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ,
iwu gị dị nʼime obi m.” 9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi;
dịka ị maara, o Onyenwe anyị,
anaghị m emechi ọnụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.