Abụ Ọma 40:8
Psalms 40:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.”
Psalms 40:8 in English
Psalms 40:8 · Berean Standard Bible
I delight to do Your will, O my God;* Your law is within my heart.”
Context
6Aja na onyinye* abụghị ihe ị chọrọ
ma ị megheela ntị abụọ;
aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m,
e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ,
iwu gị dị nʼime obi m.” 9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi;
dịka ị maara, o Onyenwe anyị,
anaghị m emechi ọnụ m. 10Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m,
ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.
Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị,
nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.