Abụ Ọma 40:10
Psalms 40:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
Psalms 40:10 in English
Psalms 40:10 · Berean Standard Bible
I have not covered up Your righteousness in my heart; I have declared Your faithfulness and salvation; I have not concealed Your loving devotion and faithfulness from the great assembly.
Context
8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ,
iwu gị dị nʼime obi m.” 9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi;
dịka ị maara, o Onyenwe anyị,
anaghị m emechi ọnụ m. 10Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m,
ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.
Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị,
nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ. 11O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị,
ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile. 12Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu;
mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ:
ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi,
obi m na-adakwa mba nʼime m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.