Native Bible

Psalms 40:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, obi m na-adakwa mba nʼime m.

Psalms 40:12 in English

Psalms 40:12 · Berean Standard Bible

For evils without number surround me; my sins have overtaken me, so that I cannot see. They are more than the hairs of my head, and my heart has failed within me.

Context

10Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ. 11O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị, ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile. 12Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, obi m na-adakwa mba nʼime m. 13O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m; O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka. 14Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.