Native Bible

Psalms 40:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere.

Psalms 40:14 in English

Psalms 40:14 · Berean Standard Bible

May those who seek my life be ashamed and confounded; may those who wish me harm be repelled and humiliated.

Context

12Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, obi m na-adakwa mba nʼime m. 13O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m; O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka. 14Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere. 15Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha. 16Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.