Abụ Ọma 40:11
Psalms 40:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị, ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.
Psalms 40:11 in English
Psalms 40:11 · Berean Standard Bible
O LORD, do not withhold Your mercy from me; Your loving devotion and faithfulness will always guard me.
Context
9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi;
dịka ị maara, o Onyenwe anyị,
anaghị m emechi ọnụ m. 10Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m,
ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.
Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị,
nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ. 11O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị,
ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile. 12Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu;
mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ:
ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi,
obi m na-adakwa mba nʼime m. 13O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m;
O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.