Native Bible

Psalms 40:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.*

Psalms 40:4 in English

Psalms 40:4 · Berean Standard Bible

Blessed is the man who has made the LORD his trust, who has not turned to the proud, nor to those who lapse into falsehood.*

Context

2O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo. 3O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị. 4Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.* 5O Onyenwe anyị Chineke m, ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ, ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile ị kwadooro maka inye anyị; a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha, ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu. 6Aja na onyinye* abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.