Abụ Ọma 40:4
Psalms 40:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.*
Psalms 40:4 in English
Psalms 40:4 · Berean Standard Bible
Blessed is the man who has made the LORD his trust, who has not turned to the proud, nor to those who lapse into falsehood.*
Context
2O sitere nʼolulu na-amị amị,
nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m;
o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume,
nyekwa m ebe siri ike ka m guzo. 3O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m,
abụ otuto nye Chineke anyị.
Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu,
ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị. 4Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,
onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;
onye na-adịghị ele ndị mpako anya
maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.* 5O Onyenwe anyị Chineke m,
ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ,
ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile
ị kwadooro maka inye anyị;
a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha,
ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu. 6Aja na onyinye* abụghị ihe ị chọrọ
ma ị megheela ntị abụọ;
aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.