Abụ Ọma 40:2
Psalms 40:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.
Psalms 40:2 in English
Psalms 40:2 · Berean Standard Bible
He lifted me up from the pit of despair, out of the miry clay; He set my feet upon a rock, and made my footsteps firm.
Context
1Eji m ndidi chere Onyenwe anyị,
ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m. 2O sitere nʼolulu na-amị amị,
nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m;
o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume,
nyekwa m ebe siri ike ka m guzo. 3O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m,
abụ otuto nye Chineke anyị.
Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu,
ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị. 4Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,
onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;
onye na-adịghị ele ndị mpako anya
maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.