Abụ Ọma 40:3
Psalms 40:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.
Psalms 40:3 in English
Psalms 40:3 · Berean Standard Bible
He put a new song in my mouth, a hymn of praise to our God. Many will see and fear and put their trust in the LORD.
Context
1Eji m ndidi chere Onyenwe anyị,
ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m. 2O sitere nʼolulu na-amị amị,
nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m;
o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume,
nyekwa m ebe siri ike ka m guzo. 3O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m,
abụ otuto nye Chineke anyị.
Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu,
ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị. 4Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,
onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;
onye na-adịghị ele ndị mpako anya
maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.* 5O Onyenwe anyị Chineke m,
ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ,
ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile
ị kwadooro maka inye anyị;
a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha,
ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.