Abụ Ọma 4:5
Psalms 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu, chụkwaranụ ya aja ezi omume.
Psalms 4:5 in English
Psalms 4:5 · Berean Standard Bible
Offer the sacrifices of the righteous and trust in the LORD.
Context
3Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya;
ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya. 4Maanụ jijiji, unu emehiekwala;
mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu;
nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela 5Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu,
chụkwaranụ ya aja ezi omume. 6Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?”
Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị. 7Were ọṅụ mejupụta obi m
karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.