Abụ Ọma 4
Psalms 4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Zaa m mgbe m na-akpọku gị
Chineke m, gị onye ezi omume;
Napụta m site nʼihe mgbu m,
meere m ebere, nụrụkwa ekpere m. 2Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere?
Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie?* Sela 3Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya;
ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya. 4Maanụ jijiji, unu emehiekwala;
mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu;
nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela 5Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu,
chụkwaranụ ya aja ezi omume. 6Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?”
Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị. 7Were ọṅụ mejupụta obi m
karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu. 8Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo,
nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị,
na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.
4:2 Nke unu maara na ha bụ okwu ụgha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.