Abụ Ọma 4:3
Psalms 4:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.
Psalms 4:3 in English
Psalms 4:3 · Berean Standard Bible
Know that the LORD has set apart the godly for Himself; the LORD hears when I call to Him.
Context
1Zaa m mgbe m na-akpọku gị
Chineke m, gị onye ezi omume;
Napụta m site nʼihe mgbu m,
meere m ebere, nụrụkwa ekpere m. 2Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere?
Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie?* Sela 3Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya;
ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya. 4Maanụ jijiji, unu emehiekwala;
mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu;
nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela 5Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu,
chụkwaranụ ya aja ezi omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.