Abụ Ọma 3
Psalms 3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m. 2Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,
“Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela* 3Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;
I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ. 4Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,
ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela 5Edinara m ala, hie ụra,
ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche. 6A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,
agaghị m atụ egwu ọbụla. 7Bilie Onyenwe anyị!
Zọpụta m Chineke m!
Tie ndị iro m niile aka nʼagba;*
tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ. 8Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa.
Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela
3:2 Okwu Hibru nʼusoro abụ nke a na-amaghị ihe ọ pụtara, ụfọdụ na-eche na ọ bụ okwu ntụziaka nye ndị ọbụ abụ banyere ihe ha ga-eme
3:7 Job 16:10
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.