Abụ Ọma 2
Psalms 2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo?*
Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru? 2Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha,
ndị na-achị achị na-agbakọtakwa
imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ. 3Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị
ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.” 4Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị.
Onyenwe anyị na-akwa ha emo. 5Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba
mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya. 6“Mụ onwe m eguzobela m eze m
na Zayọn, ugwu m dị nsọ.” 7Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị:
Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m;
taa abụrụla m nna gị. 8Rịọọ m,
aga m enye gị mba niile nke ụwa
ka ha bụrụ ihe nketa gị. 9Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha,
tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.” 10Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche;
ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa. 11Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe;
jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya. 12Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya,
ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu.
Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya.
Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.
2:1 Ya bụ, ịgbakọta nʼihi izu ọjọọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.