Native Bible

Psalms 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.”

Psalms 2:3 in English

Psalms 2:3 · Berean Standard Bible

“Let us break Their chains and cast away Their cords.”

Context

1Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo?* Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru? 2Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ. 3Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.” 4Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị. Onyenwe anyị na-akwa ha emo. 5Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.