Native Bible

Psalms 22:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.

Psalms 22:11 in English

Psalms 22:11 · Berean Standard Bible

Be not far from me, for trouble is near and there is no one to help.

Context

9Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara. 10Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m. 11Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso. 12Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan* gbara m gburugburu. 13Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.