Abụ Ọma 22:13
Psalms 22:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m.
Psalms 22:13 in English
Psalms 22:13 · Berean Standard Bible
They open their jaws against me like lions that roar and maul.
Context
11Anọla m ebe dị anya,
nʼihi na nsogbu dị nso.
Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso. 12Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;
oke ehi dị ike nke Bashan* gbara m gburugburu. 13Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa
asaghepụla ọnụ ha megide m. 14A wụpụla m dịka mmiri,
ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha.
Obi m agbazela dịka mmanụ,
obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m. 15Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.
Ire m na-araparakwa m nʼọnụ,
nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.